ỤFỌDỤ NDļICHE Dļ N’ETITI OLUNDļ ENUGU EZIKE NA IGBO IZUGBE

S. U. Ezeomeke

Abstract


Isiokwu nchọpụta a bụ “Ụfọdụ Ndíiche dị N’etiti Ọdịdịụdassụsụ Olundị Enugu Ezike na Igbo Izugbe”. Iji mee nchọpụta a nke ọma, anyị lebara anya n’ọtụtụ akwụkwọ ndị mmadụ derela gbasara olundị na Igbo Izugbe. Na nchọpụta anyị, anyị ghọtara na ọ bụ site n’olundị a nabatara ka e ji enweta asụsụ Igbo Izugbe. Olundị Enugu Ezike abụghị asụsụ nke aka ya kama ọ bụ otu n’ime ọtụtụ olundị dị n’asụsụ Igbo Izugbe. Ọ bụ ezie na Enugu Ezike bụ obodo buru nnukwu  ibu, ọ bụkwa eziokwu na obodo ahụ anọghị n’etiti ala Igbo ebe asụsụ Igbo Izugbe na-ekpo ọkụ mana ha bụ ndị Igbo, bụrụ ndị na-asụ Igbo n’agbanyeghi na ha nwere ụdaume itoolu ebe Igbo Izugbe nwere asatọ. E lebawa olundị ndị ọzọ dị n’Igbo Izugbe ma ọ bụ n’asụsụ ọ bụla anya, a ga-ahụ ndịiche. Ọ bụghị n’ihi ndịiche ndị ahụ ga-eme ka a kpachapụ olundị ahụ n’ebe asụsụ Izugbe ahụ dị. Ha ka nọkwa n’asụsụ Izugbe ahụ. Ọ bụ nke a mere anyị ji kpebie na olundị Enugu Ezike akwụụrụghị onwe ya dị ka asụsụ nke aka ya kama ọ bụ asụsụ Igbo. 


Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright © 2014 - 2019. JMEL All Rights Reserved.

ISSN:978-978-48450-4-5     Powered by Myrasoft Systems Ltd.(Phone Number: 08062926794)